Free cookie consent management tool by TermsFeed
ISTSS Logo ISTSS Logo
 
Home > Registration > Ọgbakọ Kwa Afọ ndị ISTSS nke 38 ‎

Ọgbakọ Kwa Afọ ndị ISTSS nke 38 ‎

Nọvemba 9-12, 2022, Atlanta Marriot Marquis
 
A na-edebanye aha ugbu a!
Isonyebeghị n’otu? Sonye ugbu a ma ọ bụ mee ka nsonye gị n’otu a dịkwa ọhụrụ iji were nwee ike irite uru mwepụ ego.
 
Debanye aha gị ugbu a maka Ọgbakọ Kwa afọ nke 38 nke ndị ISTSS. Ọgbakọ a bụ nke ndị mmadụ ga-abịa n’onwe ha bido na Nọvemba 9 ruo na 12 na Atlanta Marriot Marquis Hotel dị n’Atlanta, Geogia, USA. Debanye aha ka i nwee ike sonye n’ọgbakọ a bụ ọgbakọ kacha ebe ndị ọkachamara n’ihe gbasara nsogbu mpụtara ihe ike mere mmadụ.
 
Anyị na-anabata gị ka ị gee ndị ọkachamara n’amụmamụ a ntị ma hụkwa ka ihe ha na-eme ga-esi were kwalite mmụta banyere ihe ike ime mmadụ na ọgwụgwọ ya nke na-apụta ihe oge ugbu a. Nke a bụ ezigbo ohere i nwere gị na otu gị na ndị enyi gị imekọ ihe na akụkụ ụwa niile!
 
Ihe a ga-eme
N’ime seshọn 130 nakwa seshọn posta 4, e nwere ọtụtụ ihe a ga-ahọrọ! Afọ a, e nwere ọgbakọ 6 a ga-enwe tupu Nzukọ - Pre-Meeting Institutes (PMI) iji were họrọ ihe ndị a ga-eme: Nchọpụta na Nnyocha, Bayọlọjị na Medikal, Nsogbu si ihe ike mere Ụmụaka na Ndị okenye, Enyemaka si na Klinik, Nnukwu Ọgbaghara na Ndị mmadụ ịhapụ obodo ha, Modu, Metọd na Etiks, Ndị Ọkachamara, na Ọnọdụ Ahụike Ndị mmadụ.
 
Ihe e kwesịrị ịmata banyere Ndebanye aha
Jiri n’aka na ị debanyere aha tupu Septemba 5 iji were rite uru ego e wepụrụ maka dị debanyere aha n’oge!
 
I debanyeru aha n’isi ga-eme ka:
I nwee ike isonye na seshọn niile e nwere n’ọgbakọ (ma e wepụ otu ọgbaka a ga-enwe tupu nzukọ, nke nwere ego ọzọ a na-akwụ maka ya iche)
I nwee ike isonye na seshọn posta
Sonye na Nzukọ Speshal Intrest Grup (SIG)
I nwee ohere isonye App nzukọ Kwa afọ a na-eme ọnlaịn
I nwee ohere isonye na Mmemme Nnabata
I nwee ohere ịhụ ma sonyekwa n’amụma ndị ọrụ ahụike Emory Healthcare Veterans wepụtara.
Ndebanye aha nke ndị e wegharịrị ego ha ga-akwụ
ISTSS na-ewepụrụ ndị si mba ọzọ abụghị U.S., Canada, Western Europe, Australia na New Zealand ego n’ego ndebanye aha. Hụ ka e si wegharị ego e ji edebanye aha ebe a (https://istss.org/ISTSS_Main/media/Documents/ISTSS-2022-Annual-Meeting-Sliding-Scale.pdf). Akwụkwọ ndebanye aha ọnlaịn nke ISTSS na-egosi ka e si were wegharị ọnụ ego dị ka o si were metụta ebe i kwuru na i si. Ọ bụrụ na ị naghị ahụ ego ole kwesịrị maka ebe i si, kpọtụrụ isi Ụlọ ọrụ ISTSS.  
 
Iwu banyere COVID-19
ISTSS ga-achọ ka ndị niile ga-abịa Ọgbakọ Kwa afọ nke 2022 gbasoo usoro e wepụtara banyere COVID-19 oge a na-eme nzukọ a nke si n’aka Ụlọ ọrụ mba U.S. na-ahụ maka Nlekọta na Mgbochi ọrịa, steti na lokal gọvmenti, nakwa Atlanta Marriott Marquis Hotel (nke gụnyere ihe na-egosi na ị gbazuru ọgwụ mgbochi COVID-19). Ndị nwere nsogbu ma ọ bụ ọdachi pụrụ iche kpọtụrụ Onye Nlekọta.

Return to Registration Page