Free cookie consent management tool by TermsFeed
ISTSS Logo ISTSS Logo
 
Home > AM23 > ISTSS 39th Annual Meeting > Ọgbakọ Ọmenafọ ISTSS NKE 39

Ọgbakọ Ọmenafọ ISTSS NKE 39

Isiokwu: I ji ọnụ ọgụgụ rụtụ aka n’ụzọ a ga-eji were so mpụtara ihe ike mere mmadụ  na mba ụwa niile: Ihe ndị dị ọhụrụ na Imepụta ya.

Ụbọchị ọgbakọ: Novemba 1- 4, 2023‎
Ebe a ga-eme ya: The Westing Bonaventure Hotel & Suites, Los Angeles, California, ‎USA ‎

Nchọcha dị ọhụrụ na usoro nchọcha klinik nabatara njekọta nsogbu uche na nke ahụ na-apụta ‎ma e nwechaa nnukwu ọdachi bụ ihe ndị a chọrọ iji were mee ka nchọcha banyere nsogbu ọrịa ‎a na-enwe ma e nwechaa oke mmekpa ahụ na mmepụta ya pụta ihe. Anyi na-akpọ gị ka ị bịa ‎tụnye ọkpụrụkpụ ihe nke gị n’ọgbakọ ebe ndị otu anyị na ndị bịara ọgbakọ nọ. ‎

Ọgbakọ 39 nke ISTSS ga-agbado ụkwụ n’usoro dị ọhụrụ e nwere ike iji (ma jirikwa ọnụ ọgụgụ ‎rụtụ aka) were tinye ọnụ n’oke mmekpa ahụ na-eso mgbe e nwechara ọdachi n’uche nakwa ‎n’ahụ. N’ime nke a, anyị na-achọ ngụpụta na-enyocha ụzọ dị iche iche a ga-esi jiri ọnụ ọgụgụ ‎na teknọlọjị were mụọ ma gwọkwa PTSD. N’ịga n’ihu, anyị na-achọkwa ngụpụta metụtara usoro ‎nnyocha ndị amabu na mbụ nakwa ụzọ dị iche iche a ga-agbaso iji were mee nchọcha ma ‎ghọtakwa ọmụmụ banyere nsogbu uche ezuchaghị oke nke si na mmekpa ahụ na-eso mgbe e ‎nwechara ọdachi. Ọzọkwa, anyi nwekwara mmasị na nchọcha metụrụ aka na nsogbu ọrịa dị ‎iche iche si n’oke mmekpa ahụ na-eso mgbe e nwechara ọdachi. Anyi na-anabatakwa ngụpụta ‎na-ekwu maka ọrịa ndị na-abịa n’uche mgbe e nwechaa mmekpa ahụ na-abịa mgbe ihe ọdachi ‎mechara, tinyekwara ọnọdụ ahụike nke uche nakwa nke ahụ mgbe e nwechara ihe ndị na-‎adapụta mgbe e nwechara ihe ọdachi. Site n’ihe ndị a na-eme iji were belata nsogbu dị, ụzọ ndị ‎dị ọhụrụ ọgwụgwọ nke nnyocha transdiagonistiks nakwa usoro ọgwụgwọ ewepụtara iji were ‎kwuo maka ọrịa ndị na-adapụta mgbe e nwechara ihe ọdachi ga-agbado ụkwụ n’isiokwu nke ‎ọgbakọ a. Ebumnuche nchọcha a bụ iji were gosi ebe e nwere ike inwe njiko ma ọ bụrụ na anyị ‎gbasaa aka gafee ebe PTSD dị ya na igosipụta ka usoro ndị a si were di mma ma mee ka e ‎nwee ezigbo nghọta ga-eme ka a kwalite ndụ ndị nwere nsogbu na-apụta ma e nwechaa ‎ọdachi.  ‎

Ebumnuche Ihe ọmụmụ: ‎

  • Ịkọwaa ka a ga-esi were tinye ihe ndị dị ọhụrụ na teknọlọjị n’ọmụmụ na ọgwụgwọ ‎PTSD. ‎
  • Ịkọwaa ka e nwere ike iji usoro nnyocha nsogbu uche dị iche iche were ghọta mpụtara ‎nnyocha uche ka e nwechara mmekpa ahụ si n’ọdachi.   ‎
  • Ịchọpụta ụzọ ọhụrụ nakwa i ji ntụle ọnụ ọgụgụ were nyochaa ọnọdụ mmekpa ahụ dị ‎iche iche e nwere si n’ọdachi nwere ike ime ka ọrịa uche nakwa nke ahụ dị oke njọ.‎
  • Ịkpa agamnihu e nwere na ihe ndị emepụtara gbara ọkpụrụkpụ nakwa ntụle e ji ọnụ ‎ọgụgụ were mee rụtụrụ aka n’ọtụtụ mpụtara nsogbu a na-apụta ma e nwechaa ‎ọdachi. ‎
Usoro COVID-19:‎
ISTSS ga-achọ ka ndị ga-abịa Ọgbakọ Omenafọ 2023 gbasoo ntụziaka e nyere banyere to ‎COVID-19 dị oge a na-eme ọgbakọ a nke si n’aka ụlọ ọrụ mba U. S na-ahụ maka mgbochi ọrịa ‎bụ U.S. Centers for Disease Control and Prevention, steti na lokal gọvment, na ụlọ ebe a na-‎eme ọgbakọ, Westin Bonaventure Hotel & Suites. Onye ọbụla nwere ike kpọtụrụ onye isi ISTSS ‎iji kọwaa banyere ọnọdụ ndị pụrụ iche. ‎
‎ ‎
Biko gaa na ISTSS 39th Annual Meeting web page maka ozi ndị ọzọ.‎