Free cookie consent management tool by TermsFeed
ISTSS Logo ISTSS Logo
 

Nhọpụta maka Onyinye Nkwanye ugwu ISTSS nke 2023‎

Otu Komitii ISTSS na-ahụ maka Onyinye Nkwanye ugwu ji obi aṅụrị ekwu na ebidola nhọpụta maka Onyinye Nkwanye ugwu nke 2023. ISTSS na-enye onyinye dị iche iche iji were kwanyere ndị bụ ọkaibe na nchọcha, ndị na-arụ n’ụlọ ọgwụ, nakwa ndị na-ahụ maka mmekpa ahụ na-eso mgbe e nwechara ihe ike ugwu. Otu a gakwa eme ka a mata ndị nwetere onyinye nturu ugo n’ọgbakọ omenafọ ISTSS nke 39 nke e mere bido na Nọvemba 1 ruo na 4, 2023 na Lọs Anjeles, Kalifonia, USA. A ga na-anabata nhọpụta ruo na Mee 15, 2023 na 11:59 abalị n’oge ndị Isten Deelaịt, US.
 
N’onyinye nkwanye ugwu ọbụla, mmadụ nwere ike họpụta onwe ya ma ọ bụ mmadụ ahọpụta ya. E nwekwara ike họpụta otu onye maka onyinye nkwanye ugwu dị iche iche. Mgbe a na-atụle onye a ga-ahọpụta maka nturu ugo a, ISTSS na-achọ ka e si na mpaghara enwebeghị ezigbo nnọchiteanya na nakwa mba ndị adịghị na Nọt Amerika, nakwa n’ime ya. Ndị a họpụtara  dịka ndị so achị otu a agaghị eso na ndị a ga-ahọpụta maka onyinye nkwanye ugwu a.
 
Maka ihi ọnụ ọgụgụ ndịa e deturu maka onyinye nkwanye ugwu a, komiti agaghị enwe ike ileba ihe ọzọ a gbakwụnyere anya. Agaghị eleba akwụkwọ e tinyere gafere mkpụrụokwu ma ọ bụ ihu akwụkwọ ọle a chọrọ anya.
 
Onye ọbụla nwere ajụjụ kpọtụrụ Komiti na-ahụ maka Onyinye Ngwanye ugwu na [email protected].