Akpọmoku maka ịhọpụta ndị a ga-enye onyinye
Mgbe ọ ga-akwụsị: June 30, 2022
ISTSS na-enye onyinye dị iche iche iji were gosipụta mbọ ndị na-eme nchọcha, ndị na-arụ na klinik nakwa ndị ọzọ nwere mmasị n’ọmụmụ nsogbu mpụtara ihe ike mere mmadụ. Maka onyinye ọbụla, mmadụ nwere ike họpụta onwe ya ma ọ bụ onye ọzọ ahọpụta ya. E nwekwara ike họpụta otu onye maka onyinye dị iche iche. Mgbe a na-ele onye a ga-enye onyinye a, ISTSS chọrọ ka ị lebaa anya na ndị nọ na Nọt Amerika, nakwa ndị nọ nso. Ndị bọọd a họpụtara esoghi na ndị tozuru maka onyinye ISTSS.
Gaa na pej onyinye maka ozi ndị ọzọ.
Onyinye ndị a ga-enye
Onyinye ISTSS maka Ndị nchọcha amachaghị ka e si kwesị ịma ha
Onyinye a na-enye ohere ka ndị nchọcha ma ihe ekwe na-akụ n’akụkụ ụwa niile bụ ndị isi ojii na/ma ọ bụ ndị bụ ụmụ amaala ndị nwere ezigbo ọzụzụ sonye n’otu.
Ka ị ga-esi were họpụta ndị a ga-enye Onyinye isonye n’otu nke ISTSS maka Ndị nchọcha amachaghị.
Zite akwụkwọ atọ a site na ịmetụ aka na bọtịn nhọpụta dị n’okpuru:
- Nkenke edemede (erughị otu ihu akwụkwọ) banyere ebe ị na-eme nchọcha; ihe mere iji were chọọ ịbụ onye otu ISTSS, ma ọ bụ ihe mere ị ka ji chọọ ị bụ onye otu ISTSS ma ọ bụrụ na ị bụ onye otu ISTSS ugbu a; ka ISTSS ga-esi were nyere ihe ị na-eme aka nakwa ka ị ga-esi were kwalite ISTSS ma ọ bụ ka isirila kwado ya ruo ugbu a.
- Obere edemede banyere ndụ gị (nkeji abụọ ma ọ bụ atọ), tinyekwara ihe a ga-eji were mara na ị bụ onye isi ojii na/ma ọ bụ nwa amaala.
- Nkenke edemede CV banyere onye a na-ahọpụta.
Ndị mmadụ nwere ike tinye akwụkwọ maka onwe ha ma ọ bụ etinye akwụkwọ iji họpụta ha ma ha abụ ndị otu ISTSS ma abụghị.
Onyinye ISTSS banyere Njem
ISTSS na-enye onyinye ole ma ole maka njem afọ ọbụla. Ohere ole ma ole dị maka Onyinye Njem iji were nyere ndị si ebe a na-eleghara anya na mba ụwa aka nakwa enwe nsogbu ego.
Ka e si ahọpụta
Zite akwụkwọ anọ a site na ịmetụ aka na bọtịn nhọpụta dị n’okpuru:
- Akwụkwọ e tinyere eji achọ ime njem
- Ederede iji gosi uru na mkpa ime njem Nzụkọ kwa afọ dị.
- Edemede CV ka dị ọhụrụ
Leta e ji nye nkwado
Return to Awards and Honors