Home 9 Awards 9 Ịhọpụta ndị mmadụ maka onyinye nturu ugo ISTSS 2024

Ịhọpụta ndị mmadụ maka onyinye nturu ugo ISTSS 2024

ISTSS na-enye ndị bụ okaibe na nchọcha, ndị na-arụ na klinik nakwa ndị ihe ọmụmụ banyere nsogbu na-eso ma mmadụ nwechaa ọdachi na-amasị iji were gosipụta mbọ ha gbara, onyinye nturu ugo dị iche iche. Ndị otu a ga-eme nke a n’Ọgbakọ nke ISTSS nke 40 na Septemba 25-28, 2024, na Boston, Masachusets nke dị na mba Amerika.

E nwekwara ike họpụta otu onye maka onyinye dị iche iche. Mgbe ị na-eme nhọpụta a, ISTSS na-achọ ka e si ebe enwekebeghị ndị mmadụ n’otu ha nakwa na mba ndị ọzọ adịghị na Nọt Amerika nakwa ndị nọ na ya. Ndị a họpụtara nọ na bọọd etozughị na ndị a ga-enye onyinye a.

Maka ajụjụ gbasara onyinye ISTSS nke a, biko kpọtụrụ ụlọ ọrụ ndị isi ISTSS.

Onyinye ndị a gụnyere:

Onyinye ego maka njem

Kwa afọ, ụfọdụ ndị ọkachamara banyere nsogbu na-eso ihe ike na-eme ụchọcha dara ụda tinyekwara oke ọrụ ha na-arụ na klinik n’ebe ka na-eme mmepụ n’akụkụ ụwa dị iche iche mana ha anaghị enwe ike ịbịa ọgbakọ ISTSS, a na-eme kwa afọ maka ihi ụkọ ego. E nwere onyinye ọle ma ọle si na ISTSS e dowere iji were kwado ndị si na mba ka na-eme mmepe (I ji ma atụ, mba ndị akụ na ụba ha esighị ike, ndị bi ebe akụ na ụba anaghị eru n’obodo akụ na ụba ha siri ike) ihụ ego ha ga-eji were mee njem na-ahịa ahụ. Onyinye njem ndị a bụ nke ndị otu ISTSS tụkọtara n’onwe ha nke anaghị abụ otu ihe kwa afọ.  

Onyinye maka ndị nchọcha enweghị ọtụtụ ndị mmadụ

A na-akpapụkarị ndị isi ojii n’akụkụ ma na-emesokwa omume ike ka ọ dị ugbu a. Ọzọ kwa, ndị nchọcha si na mpaghara a enwekebeghị ndị mmadụ na amụmamụ nsogbu na-esochi ọdachi ya nakwa n’otu ISTSS. N’igbaso ebumnuche anyị ihụ na e nwere ezigbo nnọchiteanya n’amụmamụ a nakwa na mba ụwa, tinyekwara inye ndị nchọcha na-etolite ọhụrụ nkwado, onyinye a ga-eme ka e nwee nsonye nke ndị dị n’otu isonye were kpọkọọ ndị nchọcha ma ihe ekwe na-akụ n’akụkụ ụwa dị iche iche ndị gosipụtara onwe ha na ha bụ ndị isi ojii. Ndị nwetere onyinye a na-enwete ịbụ onye otu a n’ime otu afọ ya nakwa ịga ọgbakọ mmụta. Ndị mmadụ nwere ike itinye akwụkwọ maka nke a ma ha eso ma ọ bụ hapụ iso na ISTSS ugbu a. 

Onyinye njem ụmụ akwụkwọ

Onyinye njem ụmụ akwụkwọ dị $2,000 ka a na-enye ụmụ akwụkwọ iji were kwado nsonye ha na ihe ha na-etinye n’ọgbakọ ISTSS. Ndị ga-enweta onyinye a ga-ekwu na ha ga-abịa sonye mee ihe a na-eme ma ọ bụrụ na ha nwete ya. A ga-aka were leba anya n’ebe ụmụ akwụkwọ enwekebeghị ndị mmadụ nọ tinyekwara ndị si mba akụ na ụba ha esighị ike.