Free cookie consent management tool by TermsFeed
ISTSS Logo ISTSS Logo
 
Home > ISTSS 38th Annual Meeting > Oke Mmekpa Ahụ Dịka Ihe A Chọpụtara Nwere Ike Inye Onye Ọbụla Nsogbu Na Ndụ

Oke Mmekpa Ahụ Dịka Ihe A Chọpụtara Nwere Ike Inye Onye Ọbụla Nsogbu Na Ndụ

E nwere oke mkpa dị na a hụtara ọtụtụ ịhe oke mmekpa ahụ na-eme.   Site n’ihe oke mmmekpa ahụ metụtara ọrịa ozuruụwa ọnụ bụ COVID-19 were gaa ka ihe si eme n’obodo mgbe niile na-emekpa ndị mmadụ oke ahụ n’ihi akpọmasị, akpamooke agbụrụ, na mmegbu si n’akụkọ a kọrọ akọ, anyị nọ n’oge chọrọ ntụgharị uche nakwa nchọcha sayensị n’ụzọ a ga-esi were mee ka oke mmekpa ahụ bụrụ ihe a ga-etinye n’obi na mmụọ ndị mmadụ ya nakwa na nke obodo. N’agbanyeghị na PTSD bụ nke a na-ahụkarị dịka ọrịa isi metụtara oke mmekpa ahụ, mpụtara oke mmekpa ahụ bụ nke a ma dị ka nke na-emetụta ọtụtụ ihe n’uche nakwa n’ahụ na ndụ mmadụ. Ya bụ, nnukwu mmekpa ahụ bụ nke a ga-ahụta dị ka nke a chọpụtara nwere ike inye onye ọbụla nsogbu n’ọtụtụ usoro ahụike nke uche nakwa nke ahụ nke nwere ịdị ebe a ga-achọpụtanwu ya. Nchọcha ndị dị ọhụrụ na usoro nleta ndị ọrịa nabatara ọtụtụ ọrịa uche nakwa nke ahụ mgbe e nwechara oke mmekpa ahụ bụ nke a chọrọ iji were kwalite nchọcha gbasara oke mmekpa ahụ.
 
Ọgbakọ nke 38 nke ndị ISTSS ga-eleba anya na mgbasa ọnọdụ ahụ ike nke metụtara nnukwu mmekpa ahụ na ndụ mmadụ. Nzukọ nke afọ a ga-egosipụta ọtụtụ ụzọ dị iche iche nke oke mmekpa ahụ ga-esi apụta ihe n’ahụike uche na nke ahụ, n’ebe ọtụtụ ndị mmadụ nọ. I ji were mee nke a, anyị na-achọ nkụzi metụtara nnyocha n’ụzọ ochie nke ga-agbaso usoro dị iche iche iji were ghọta oke mmekpa ahụ metụtara ọrịa isi. N’aka nke ọzọ, anyị chọkwara nchọcha metụtara ọrịa dị iche iche gbadoro ụkwụ na oke mmekpa ahụ. Anyị ga-anabakwa nkụzi metụtara ọnọdụ ahụike abụọ ma ọ bụ karịa na-abịa mgbe e nwechara oke mmekpa ahụ, tinyekwara ọnọdụ uche na nke ahụike mgbe e nwechara oke ihe mmekpa ahụ. Dị ka o si metụta ọrụ mgbchi, usoro nnyocha dị ọhụrụ e ji agwọ ọrịa nakwa usoro e wepụtara iji were iji were gbochie ọnọdụ ahụike abụọ ma ọ bụ karịa na-abịa mgbe e nwere oke ihe mmekpa ahụ bụ nke ha na isiokwu ọgbakọ a ga-agakọ. Ebumnuche ọgbakọ a bụ iji were gosi njikọ e nwere ike ịnwe mgbe anyị gbasara aka gafee PTSD ma gosikwa ka usoro ndị a ga-esi mee ka e nwee usoro zuru oke maka ikwalite ndụ ndị nwere oke mmekpa ahụ.
 
Ebumnuche Mmụta:
  1. Ịkọwa ka e nwere ike iji usoro nnyocha were ghọta ngosipụta ọgwụgwọ ọrịa isi si n’oke mmekpa ahụ
  2. Igosipụta ụzọ dị iche iche ihe a gabigara mgbe e nwere oke mmekpa ahụ nwere ike ime ka aghara inwe ezigbo ahụike na ndụ mmadụ
  3. Ịkwu mbọ a gbarala n’ọgwụgwọ oke mmekpa ahụ na-eleba anya n’ihe oke mmekpa ahụ na-eme banyere ahụike
Anyị ga-anabatakwa ihe ndị e dere n’isiokwu ndị a nakwa ndị metụtara ha:
  • Nchọcha banyere ụzọ dị iche iche eji amụ banyere ngosipụta ọgwụgwọ ọrịa isi si n’oke mmekpa ahụ ma e nwechaa oke mmekpa ahụ
  • Nchọcha na-egosipụta otu ọrịa uche ma ọ bụ karịa a na-enwe ma e nwechaa oke mmekpa ahụ (I ji ma atụ, PTSD na nsogbu ọgwụ ike)
  •    Nchọcha banyere ọrịa dị iche nke uche na nke ahụ nwere ike ibido mgbe e nwechara oke mmekpa ahụ
  • Nchọcha chịkọtara ogo ntụcha dị iche iche (I ji ma atụ, nke ahụ, nke uche, nke metụtara ndị mmadụ) iji were hụ ihe ndị na-eso ka uche na ahụ mmadụ dị mgbe e nwechara oke mmekpa ahụ
  • Nchọcha ga-agbaso usoro ndụ mmadụ iji leba anya banyere ka oke mmekpa ahụ ga-esi metụta ahụ ike nke uche na/ma ọ bụ mee ka ‘ọ banye n’ahụ’ iji kwalite ahụike
  • Nchọcha banyere usoro ọgwụgwọ dị ọhụrụ ga-ebelata ọtụtụ nsogbu na-eso oke mmekpa ahụ (I ji ma atụ, usoro ọgwụgwọ nke nnyocha, ihe ndị na-ebelata nsogbu uche na nke ahụ mgbe e nwechara oke mmekpa ahụ)